Matthew 22:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha kpebiri iziga ụfọdụ mmadụ ndị si nꞌotu Herọd. Ndị a bịara jụọ ya ajụjụ a, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu. Ị na-ezikwa eziokwu, na-echeghị echiche ihe ọjọọ ga-adakwasị gị. Ị dịghị asọkwa onye ọ bụla anya, nꞌihi na ị dịghị ele mmadụ anya nꞌihu.
Igbo 2006
Ha we zigara Ya ndi nēso uzọ-ha, ha na ndi Herod, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I nēzí kwa uzọ Chineke n'ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha zigara ndị na-eso ụzọ ha na ndị nʼotu Herọd ka ha jụọ ya sị, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu, na ị na-ezikwa ụzọ Chineke nʼeziokwu. Ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ.