Matthew 22:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nꞌọnwụ adịghị, bịakwutere Jisọs ịghụ ya ọnụ. Ha gwara ya sị, “Onye ozizi, Mosisi kwuru sị, ọ bụrụ na nwoke ọ bụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne nwoke ahụ ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ. Ụmụ ọ bụla nwanyị a mụtara site na di ọhụrụ ya ga-erite ihe nile nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwere.
Igbo 2006
N'ubọchi ahu ndi-Sadusi biakutere Ya nāsi na nbilite-n'ọnwu adigh: ha we jua Ya,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya ịghụ ya ọnụ.