Matthew 22:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ọ dị otu ezinụlọ ebe e nwere ụmụnne nwoke asaa. Nwoke nke mbụ lụrụ nwụnye, ma ọ nwụrụ na-amụtaghị nwa. Nꞌihi nke a nwanyị ahụ ghọrọ nwụnye nwanne ha nwoke nke abụọ.
Igbo 2006
Ma umu-nne-ndikom asa di n'etiti ayi: nke-mbu luru nwunye, we nwua, ma ebe ọ nēnweghi nkpuru ọ rapuru nwunye-ya nye nwa-nne-ya;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa nʼetiti anyị. Onye nke mbụ lụrụ nwunye, nwụọ, ma ebe ọ dịghị ụmụ ọ mụtara, ọ hapụrụ nwanne ya nwunye ya.