Matthew 23:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ahụhụ dịrụ unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha gasi bata nꞌalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata, unu adịkwaghị enye ndị ọzọ ohere ịbata. Ahụhụ dịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-eme dị ka ndị dị nsọ site nꞌikpe ogologo ekpere nꞌakụkụ ụzọ nile ka mmadụ hụ unu. Ma unu na-eripịa akụ dị nꞌụlọ ndị inyom di ha nwụrụ. Unu ga-anata ikpe ọmụma.
Igbo 2006
Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi bata nʼalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata. Unu adịghịkwa enye ndị ọzọ ohere ịbata.