Matthew 23:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ndu kpuru isi! Nꞌihi na unu na-asị, ‘Onye ọ bụla jiri ụlọ nsọ ukwu Chineke ṅụọ iyi, iyi ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọ bụla jiri ọlaedo dị nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ ṅụọ iyi kwesịrị imezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.’
Igbo 2006
Ahuhu gādiri unu, ndi-ndú ìsì, ndi si, Onye ọ bula nke gēji ulo nsọ Chineke ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ọla-edo nke ulo nsọ ahu ṅu iyí, o ji ugwọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ndu kpuru ìsì! Nʼihi na unu na-asị, Onye ọbụla jiri ụlọnsọ ṅụọ iyi, iyi ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla jiri ọlaedo dị nʼime ụlọnsọ ṅụọ iyi kwesiri imezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.