Matthew 23:29 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-ewu ili ndị amụma ahụ nna unu ha gburu, na-atụkwasị okoko osisi nꞌili ahụ e liri ndị ezi omume ahụ nna unu ha gburu.
Igbo 2006
Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēwu ílì ndi-amuma, nēdozi kwa ebe anēlì ndi ezi omume,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“E, ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta ndị ezi omume.