Matthew 23:34 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ya mere, ana m agwa unu sị, aga m ezitere unu ndị amamihe nd ndị ozizi. Ụfọdụ nꞌime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nꞌobe. Ndị ọzọ kwa ka unu ga-eyipụ uwe ha, tie ha ihe otiti nꞌazụ, nꞌime ụlọ ekpere unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nꞌotu obodo gaa nꞌobodo ọzọ.
Igbo 2006
N'ihi nka, le, Mu onwem nēzitere unu ndi-amuma, na ndi-amam-ihe, na ndi-ode-akwukwọ: ufọdu nime ha ka unu gēb͕u, kpọgide kwa ha n'obe; ufọdu nime ha ka unu gāpia kwa ihe n'ulo-nzukọ-unu, si kwa n'otù obodo nēsob͕u ha ga obodo ọzọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, aga m ezitere unu ndị amụma, ndị amamihe na ndị nkuzi. Ụfọdụ nʼime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nʼobe, ndị ọzọkwa ka unu ga-apịa ihe nʼụlọ nzukọ unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nʼotu obodo gaa nʼobodo ọzọ.