Matthew 23:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nꞌihi ọbara ndị amụma Chineke nile unu kwafuru, site nꞌọbara Ebel ruo na nke Zakaraya nwa Barakaya, onye unu gburu nꞌetiti ụlọ nsọ na ebe ịchụ aja unu.
Igbo 2006
ka ọbara ndi ezi omume nile awusiworo n'elu uwa we biakwasi unu, site n'ọbara Ebel onye ezi omume ahu rue ọbara Zakaraia nwa Barakaia, onye unu b͕uru n'ab͕ata ulo nsọ na ebe-ichu-àjà-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nʼihi ọbara nke ndị ezi omume niile e gburu nʼụwa, site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya nwa Berekaya, onye unu gburu nʼetiti ụlọnsọ nʼebe ịchụ aja unu.