Matthew 23:37 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Oo Jerusalem, Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma, na nke na-atụ ndị nile Chineke ziteere gị nkume. Ugbu ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị ọnụ dị ka nne ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya nꞌokpuru nku ya ichebe ha, ma ị chọghị ka m mee otu a!
Igbo 2006
Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“O Jerusalem, Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma, na nke na-atụ ndị niile e ziteere gị nkume. Ugboro ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ si achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya ichebe ha? Ma ị chọghị ka m mee otu a!