Matthew 23:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ihe nile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ too ha. Ha na-ejegharị dị ka ndị dị nsọ. Leenụ ka igbe ha kekwasịrị nꞌegedege ihu ha na nꞌaka ha siri buo ibu. Igbe ebe ha tinyere amaokwu ha depụtara site nꞌakwụkwọ nsọ!
Igbo 2006
Ma ọlu-ha nile ka ha nālu ka madu we kiri ha: n'ihi na ha nēme ka phylactery nile ha di obosara, me kwa ka ọnu-ọnu uwe-ha di uku,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ihe niile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ hụ ha. Ha na-eme ka igbe nta e tinyere iwu ndị dị mkpa e depụtara nke ha na-ekekwasị nʼegedege ihu na nʼaka dị obosara na-emekwa ka ọnụnụ uwe ha buo ibu.