Matthew 24:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu hụrụ ụlọ ukwu a? Nꞌezie, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nꞌelu ibe ya.”
Igbo 2006
Ma Ọ zara, si ha, Ùnu ahughi ihe ndia nile? n'ezie asim unu, Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ zara ha sị, “Unu hụrụ ihe ndị a niile? Nʼezie agwa m unu, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nʼelu ibe ya, nke a na-agaghị akwatu nʼala.”