Matthew 24:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ndị ga-asị na ha bụ Onye nzọpụta, ha na dị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe ịtụnanya dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ gaara ekwe mee, ha ga-esite nꞌọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ Chineke họpụtara.
Igbo 2006
N'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe oke ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-esite nʼọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ a họpụtara.