Matthew 24:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Obodo ga-alụso obodo ibe ya ọgụ, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; ọke ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa nꞌọtụtụ ebe dị iche iche.
Igbo 2006
N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: oké unwu na ala-ọma-jijiji gādi kwa n'ebe di iche iche.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ, na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche.