Matthew 25:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ụmụ agbọghọ ndị nzuzu ahụ gara. Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwụnye ọhụrụ bịarutere. Ụmụ agbọghọ ndị jikeere ejike gara zute ya, sorokwa nꞌoriri ọlụlụ nwụnye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.
Igbo 2006
Ma mb͕e ha nēje izú, onye nālu nwunye ọhu biara; ndi edoziworo we so ya ba n'oriri ọlulu-nwunye: ewe mechie uzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.