Matthew 25:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nwoke ahụ o nyere narị naịra ise batara wetakwa narị naịra ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘I nyere m narị naịra ise, ma ugbu a azụpụtala m narị naịra ise ọzọ.’
Igbo 2006
Onye ahu nke nara talent ise we biakute ya weta talent ise ọzọ, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent ise nyem n'aka: le, eritaram talent ise ọzọ n'urù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’