Matthew 25:34 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Mgbe ahụ, mụ bụ eze, ga-asị ndị nọ nꞌaka nrị m, batanụ nꞌime alaeze m, unu ndị Nna unu gọziri agọzi. Batanụ nꞌime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa.
Igbo 2006
Mb͕e ahu Eze ahu gāsi ndi nọ n'aka-nri-Ya, Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa.