Matthew 26:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nꞌime obodo sị ya, Onye ozizi anyị sịri na oge m abịala. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri mmemme ngabiga anyị nꞌụlọ gị.”
Igbo 2006
O we si, Jenu n'obodo a jekuru onye di otú a, si ya, Onye-ozizí si, Ogem di nso; Mu na ndi nēso uzọm nēme ememe ngabiga n'ulo-gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nʼime obodo sị ya, Onye ozizi sị, ‘Oge m abịala nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga nʼụlọ gị.’ ”