Matthew 26:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Lee na mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-anwụ dị ka e si buo ya nꞌamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ a ga-esite nꞌaka ya rara m nye nꞌaka ndị ga-egbu m. Ọ gaara akara ya onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”
Igbo 2006
Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ bayere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye. Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Lee Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”