Matthew 26:31 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌebe ahụ ka Jisọs nọ gwa ha okwu sị, “Nꞌabalị taa unu ga-agba ọsọ hapụ nanị m. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Aga m egbu onye ọzụzụ atụrụ ahụ, mee ka igwe atụrụ ya gbasasịa.’
Igbo 2006
Mb͕e ahu Jisus si ha, Agēme ka unu onwe-unu nile ma n'ọnyà n'arum abali ta: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu nke ìgwè aturu-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nʼabalị taa, unu niile ga-agbahapụ naanị m. Nʼihi na e dere ya, sị: “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, atụrụ nke igwe atụrụ ahụ ga-agbasasịkwa.’