Matthew 26:39 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ gara nꞌihu nke nta daa nꞌala, kpuo ihu ya nꞌala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị uche m ka m chọrọ ka o mee, kama ka e mee ihe ị na-achọ.”
Igbo 2006
O we ga n'iru nke-ntà, da kpuchiè iru-Ya n'ala, we kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na ọ gēkwe me, ka iko a gabigam: ma ọ bughi dika Mu onwem nāchọ, kama dika Gi onwe-gi nāchọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gara nʼihu nke nta daa, kpuo ihu ya nʼala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.”