Matthew 26:47 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nꞌime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndị isi nchuaja na ndị okenye ndị Juu nile zitere ha.
Igbo 2006
Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, we bia, ya na oké ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zitere ha.