Matthew 26:64 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs zara ya sị, “Ee, abụ m ya. Nꞌezie asị m unu, na mgbe na-adịghị anya, unu ga-ahụ m, bụ Onye nzọpụta ahụ, ka m na-anọdụ nꞌaka nri Chineke. Unu ga-ahụkwa m mgbe m ga-abịa nꞌigwe ojii nke eluigwe.”
Igbo 2006
Jisus si ya, Gi onwe-gi kwuru: otú ọ di, asim unu, Site n'ub͕u a unu gāhu Nwa nke madu ka Ọ nānọdu n'aka-nri nke ike, nābia kwa n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs gwara ya sị, “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m agwa unu, site ugbu a na-aga nʼihu, unu ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ nʼaka nri nke Onye dị ike, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”