Matthew 26:65 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe o kwusịrị okwu a, onyeisi nchụaja dọwara uwe o yi nꞌahụ nꞌiwe, kwụo sị, “O kwuluola Chineke! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara ajọ okwu sị ya nꞌọnụ pụta?
Igbo 2006
Mb͕e ahu onye-isi-nchu-àjà dọwara uwe-ya nile, si, O kwuluru Chineke: ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ? le, ub͕u a ka unu nuru nkwulu ahu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ onyeisi nchụaja dọwara uwe ya, kwuo sị, “O kwuola arụ! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara nkwulu ya?