Matthew 26:69 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ihe ndị a na-eme, Pita nọ nꞌime obi onyeisi nchụaja ahụ. Otu nꞌime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịakwutere ya sị ya, “Ị bụkwanụ otu nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.”
Igbo 2006
Ma Pita nọduru n'èzí n'obí: otù nwa-ab͕ọghọ we biakute ya, si, Gi onwe-gi na Jisus Onye Galili nọ-kwa-ra.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.”