Matthew 26:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ọ nọ na-eri nri nꞌebe ahụ, otu nwanyị batara nꞌime ụlọ ahụ. O ji karama mmanụ otite dị oke ọnụ ahịa nꞌaka ya. O meghere mmanụ ahụ wụọ ha nile nꞌisi Jisọs.
Igbo 2006
otù nwanyi biakutere Ya nke nēji ite alabaster, nke manu-otite di oké ọnu-ahia nke-uku di ya, o we wusa manu-otite ahu n'isi-Ya, mb͕e Ọ nọduru na nri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
otu nwanyị bu karama alabasta nke mmanụ otite isi ụtọ dị oke ọnụahịa dị nʼime ya, bịakwutere ya, nke ọ wụsara ya nʼisi dị ka ọ na-anọdụ ala nʼeri nri.