Matthew 26:73 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe oge nta gasịrị, ndị nwoke guzo nꞌebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nꞌezie, ị bụ otu nꞌime ha. Anyị esitela nꞌasụsụ ị na-asụ ghọta na ị bụ onye Galili.”
Igbo 2006
Ma mb͕e nwa oge gasiri ndi guzoro nso biakutere Pita, si ya, N'ezie gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha; n'ihi na okwu-ọnu-gi nēweputa gi n'ìhè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo nʼebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nʼezie, ịbụ otu nʼime ha, nʼihi na asụsụ gị agbaala gị ama.”