Matthew 26:75 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ kwa oke ọkụkọ kwara akwa. Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru sị, “Tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” O siri nꞌebe ahụ pụọ, gaa kwaa akwa nke ukwuu.
Igbo 2006
Pita we cheta okwu Jisus kwururi, si, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi, i gāgọnarim ub͕ò atọ. O we pua, kwa ákwá nke-uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru sị, “Tupu oke ọkpa akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” O si nʼebe ahụ pụọ, gaa kwaa akwa nke ukwuu.