Matthew 27:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌoge a Jisọs guzo nꞌihu Pailet onye na-achị Judia nile. Pailet jụrụ ya ajụjụ sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs zara sị ya, “Ee, abụ m ya.”
Igbo 2006
Ma Jisus guzoro n'iru onye-isi: onye-isi ahu we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? Jisus we si ya, Gi onwe-gi kwuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”