Matthew 27:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ndị Juu nile zukọrọ, Pailet jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ̀ bụ Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Onye nzọpụta?”
Igbo 2006
Ya mere, mb͕e ha zukọrọ, Pailat si ha, Ònye ka unu nāchọ ka m'rapuru unu? Barabas, ma-ọbu Jisus Onye anākpọ Kraist?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe igwe mmadụ niile zukọrọ, Pailet sịrị ha, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ bụ Jisọs Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?”