Matthew 27:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Pailet jụrụ ha ajụjụ sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m jiri Jisọs Onye nzọpụta mee?” Ha nile tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Kpọgide ya nꞌobe!”
Igbo 2006
Pailat si ha, Ọ̀ bu gini ka m'gēme kwa Jisus Onye anākpọ Kraist? Ha nile si, Ka akpọgide Ya n'obe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pailet sịrị ha, “Gịnị ka m ga-eme Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” Ha niile sịrị, “Kpọgide ya nʼobe!”