Matthew 27:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọzọ ọ pụrụ ime o kpebiri imere ha ihe ga-eme ka ọgba aghara hapụ ịmalite nꞌetiti ha. O weere mmiri kwọọ aka ya nꞌihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nꞌebe ọbara nwoke a dị. Ihe ọ bụla unu mere ya dị unu nꞌisi.”
Igbo 2006
Ma mb͕e Pailat huru na okwu-ya abaghi n'ihe ọ bula, kama na ùzù nāputa, o were miri, kwọ aka-ya abua n'iru ìgwè madu ahu, si, Ikpé ọbara Onye ezi omume a amaghm: unu onwe-unu le nke ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọ pụrụ ime, kama na ụzụ na ọgbaaghara na-amalite. O weere mmiri kwọọ aka ya nʼihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị. Jirinụ aka unu hụ maka ya.”