Matthew 27:29 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha chịkọtara alaka osisi nwere ogwu kpaara ya okpu. Ha yikwasịrị ya okpu ogwu ahụ nꞌisi, ka ọ bụrụ okpu eze ya. Ha tinyekwara ya osisi nꞌaka, ka ọ bụrụ mkpa nꞌaka eze ya. Mgbe ha mechara ihe ndị a, ha gburu ikpere nꞌala nꞌihu ya. Nꞌọnọdụ ịkwa ya emu ha kelere ya sị ya, “Ka eze ndị Juu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!”
Igbo 2006
Mb͕e ha kpasiri okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, nye kwa Ya amì n'aka-nri-Ya; ha we b͕ue ikperè n'iru Ya, me Ya ihe-ọchì, si, Ekele, Eze ndi-Ju!
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi. Ha tinyekwara ya mkpara achara nʼaka nri, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, na-akwa ya emo na-asị, “Ekele, Eze ndị Juu!”