Matthew 27:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, nụrụ na a mara Jisọs ikpe ọnwụ, o chigharịrị weghachikwara ndị isi nchụaja na ndị okenye ego ahụ ha kwụrụ ya.
Igbo 2006
Mb͕e ahu Judas, onye rara Ya nye, mb͕e ọ huru na amara Ya ikpé, ọ kwa uta, chighachi orú ego ọla-ọcha na iri ahu nye ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ.