Matthew 27:48 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌotu oge ahụ kwa otu onye nꞌime ha gbaara ọsọ were ọza detu ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nꞌosisi, welie ya elu, ime ka Jisọs miri ya ṅụọ.
Igbo 2006
Ngwa ngwa otù onye nime ha we b͕a ọsọ, were sponge, b͕aju ya na manya-vine b͕ara uka, tukwasi ya n'amì, nye Ya ka Ọ ṅua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼotu oge ahụ kwa otu onye nʼime ha gbaara ọsọ were ogbo denye ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nʼosisi, welie ya elu, chee ya ka ọ ṅụọ.