Matthew 27:51 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi e ji kebichie ebe nsọ site nꞌebe kachasị nsọ nke ụlọ nsọ ukwu Chineke, gbawara site nꞌelu ruo nꞌala.
Igbo 2006
Ma le, ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke b͕awara iberibe abua site n'elu rue ala; ala ma-kwa-ra jijiji; oké nkume b͕awa-kwa-ra;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara.