Matthew 27:54 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọchịagha na-achị narị ndị agha, na ndị agha ya nọ nꞌebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe nile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nꞌezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”
Igbo 2006
Ma ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, na ndi ha na ya nọ nēche Jisus, mb͕e ha huru ala-ọma-jijiji ahu, na ihe nile emere, ha tua egwu ri nne, si, N'ezie Nwoke a bu Ọkpara Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”