Matthew 27:60 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
O nyibere ya nꞌili nke aka ya, bụ nke o gwuru ọhụrụ nꞌime nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kwachie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa.
Igbo 2006
tọb͕ọ ya n'ílì ọhu nke aka ya, nke o gwuwarari n'oké nkume: o we kpọre otù nkume uku kwachie ọnu-uzọ ílì ahu, we la.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ma gaa lie ya nʼili ọhụrụ nke o gwuuru onwe ya, nʼetiti nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kpuchie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa.