Matthew 27:64 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị chee ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ahụ ya. Ka ha ghara ịsịkwa na o sitela nꞌọnwụ bilie. Ọ bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ọ ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ.”
Igbo 2006
Ya mere, nye iwu ka emechie ílì ahu si-ike rue ubọchi nke-atọ, ka ndi nēso uzọ-Ya ghara ibia zuru Ya la ma eleghi anya, we si ndi-Ju, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie: njehie ikpe-azu a gājọ kwa njọ kari nke-mbu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị na-eche ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ozu ya. Ka ha ghara ị sịkwa ndị mmadụ na o sitela nʼọnwụ bilie. Ọ bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ọ ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ.”