Matthew 27:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nꞌọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. Nꞌihi na Jeremaya kwuru sị, “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ bụ ọnụ ahia ụmụ Izirel kpebiri na ha ga-akwụ nꞌisi onye ahụ.
Igbo 2006
Mb͕e ahu okwu ekwuru site n'ọnu Jeremaia onye-amuma mezuru, si, Ha we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, bú ọnu-ahia nke Onye aruru ọnu-ahia-Ya, Onye ufọdu site na umu Israel ruru ọnu-ahia-Ya;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, bụ ọnụahịa onye ahụ, nke ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel kpebiri na a ga-akwụ nʼisi ya.