Matthew 28:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere, ndị agha ahụ naara ego e nyere ha. Ha pụrụ kọkwaara ndị Juu nile ihe ndị isi nchụaja na ndị okenye gwara ha. Ụgha ahụ ha ghara gbasara nꞌala ndị Juu nile ruo taa. Ndị Juu nabatakwara okwu ahụ ndị agha ahụ kwuru dị ka eziokwu.
Igbo 2006
Ha we nara ego ahu, me dika eziri ha: ewe b͕asa okwu a n'etiti ndi-Ju, rue ta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha naara ego ahụ, meekwa dị ka e ziri ha. Akụkọ a ka a gbasara nʼetiti ndị Juu ruo taa.