Matthew 28:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Gaanụ ngwangwa mee ka ndị na-eso ụzọ ya mata na o sitela nꞌonwụ bilie. O burula unu ụzọ gaa Galili. Ebe ahụ kwa ka unu ga-ahụ ya. Chetakwanụ ihe m gwara unu.”
Igbo 2006
Ga-kwa-nu ọsọsọ, si ndi nēso uzọ-Ya, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; ma le, O buru unu uzọ ga Galili; n'ebe ahu ka unu gāhu Ya: le, agwawom unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gaanụ ngwangwa gwa ndị na-eso ụzọ ya na e meela ka o si nʼọnwụ bilie. Lee, o burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya. Chetakwanụ ihe m gwara unu.”