Matthew 3:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ana m eme nanị ndị chegharịrị site na mmehie ha baptizim, ma onye ka m ukwuu na-abịa. Ọ dị nnọọ ukwuu na etorughị m ibu akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.
Igbo 2006
Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie ka unu we chègharia: ma Onye nke nābia n'azum kam ike, Onye m'nērughi ichi akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mụ onwe m ji mmiri eme unu baptizim nʼihi nchegharị, ma onye dị ike karịa m na-abịa. Onye m na-erughị ịchịta akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ were mee unu baptizim.