Matthew 3:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ ga-ekewapụ ezi mkpụrụ ọka site nꞌigbugbo ọka. Ọ ga-afụchapụ igbugbo ọka ahụ, zakọtaa ha, kpọọ ha ọkụ ebighị ebi. Ma ọ ga-edozikwa mkpụrụ ọka ndị dị mma.”
Igbo 2006
Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, Ọ gāfuchapu kwa ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, Ọ gēkpokọta kwa ọka-Ya n'ọba-Ya, ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe ịfụcha ọka ya dị ya nʼaka, ọ ga-azacha ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, chịkọta mkpụrụ ọka wiiti tinye ha nʼọba, ma jiri ọkụ a na-apụghị imenyụ emenyụ rechapụ igbugbo ọka.”