Matthew 4:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Jisọs zara sị ya, “Si nꞌebe m nọ pụọ, ekwensu. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ nanị Onyenwe gị Chineke ka ị ga-akpọ isi ala nye, nanị ya kwa ka ị ga-efe.’ ”
Igbo 2006
Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Jisọs sịrị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ”