Matthew 4:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu ụbọchị, mgbe Jisọs na-agafe nꞌakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saịmọn onye a na-akpọ Pita, na Anduru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ igbu azụ, ebe ha nọ nꞌụgbọ mmiri na-egbu azụ.
Igbo 2006
Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ.