Matthew 4:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọ gara nꞌihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemes na Jọn, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nꞌime ụgbọ mmiri na-emezi ihe ha ji egbu azụ. Jisọs kpọkwara ha.
Igbo 2006
O we si n'ebe ahu ga, hu umu-nne abua ọzọ, Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, nime ub͕ọ-ha, ha na nna-ha Zebedi, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù; O we kpọ ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha,