Matthew 4:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs jegharịrị nꞌobodo Galili nile na-ezi ihe nꞌọgbakọ ndị Juu nile. Ọ na-ekwusa ozi ọma nke alaeze eluigwe nꞌebe ọ bụla ọ gara. Ọ gwọkwara ọrịa dị iche iche.
Igbo 2006
Jisus we nējeghari na Galili dum, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche n'etiti ndi ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs jegharịrị nʼobodo niile nke Galili, na-akụzi ihe nʼụlọ nzukọ niile ha, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche nʼetiti ndị ahụ.