Matthew 4:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Site nꞌebe a tụda onwe gị igosi na ị bụ Ọkpara Chineke. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha ghọta gị. Ha ga-echebe gị, ka ị ghara ịmerụ ahụ.’ ”
Igbo 2006
si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, tudà Onwe-gi n'ala: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi: Ọ bu kwa n'elu aka-ha ka ha gēburu gi, Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
sị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’ ”