Matthew 5:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Unu bụ nnu nke ụwa, nꞌihi nke a unu etufula ụtọ unu. Ọ bụrụ na unu etufuo ụtọ unu, unu agaghị aba uru ọ bụla. A ga-etufu unu nꞌezi, zọokwa unu ụkwụ.
Igbo 2006
Unu onwe-unu bu nnú nke uwa: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ ghọ ezi nnú? ọ dighi kwa irè iji me ihe ọ bula ọzọ, ma-ọbughi ka etufue ya n'èzí, madu azọ ya ukwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Unu bụ nnu nke ụwa, ma ọ bụrụ na nnu adịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ọ bakwaghị uru ọbụla, ma ọ bụghị naanị itufu ya, ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ.