Matthew 5:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi ya, ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie iwu dịkarịsịrị nta, ma zikwa ndị ọzọ imebi ya, a ga-agụ onye ahụ nꞌọnye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu Chineke nꞌonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nꞌalaeze eluigwe.
Igbo 2006
Ya mere onye ọ bula nke gēmebi otù nime ihe ndia dikarisiri ntà nke enyere n'iwu, nke gēzí kwa madu otú ahu, agākpọ ya onye dikarisiri ntà n'ala-eze elu-igwe: ma onye ọ bula nke gēme ha, zí kwa ha, onye ahu ka agākpọ onye uku n'ala-eze elu-igwe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe.